O NA-ABIA OZO

Nke a bụ ozi gbasara mbilite Jisus Kraist, oku ka mmadụ nile nabata Onye-nzoputa tupu ụbọchị ikpe ikpeazụ, na amara Chineke.

IgboTractsForeign Tracts
Download

O NA-ABIA OZO


Onye na-abia?
  ‘Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu no rigo n'elu-igwe,
  gabia n'otu aka ahu dika unu kiriri Ya ka O nagan'elu-igwe.’
  Ndi Mo-Ozi abua gwara ndi neso uzo Ya nka, mgbe ha no na
  mgbaru iru ka ha n’ele anya n’elu-igwe, ebe Onye Nzoputa
  na Onye-nwe ha na-arigoro n’elu-igwe.

  Jisus Kraist kwekwara nkwa mgbe O nori n’uwa si:
  “A namaga idoziri unu ebe... A gajem ibia ozo,
  M'ganara kwa unu nye onwem.”
  Mgbe ihe dika ogu aro ato gasiri,
  Kraist kwukwara ya ozo site n’elu-igwe maka nlata Ya n’uwa
  megbe O siri: “E anam abia ososo.”

  O bibia ugbo abua nke Kraist doro anya,
  buru kwa ezi okwu edeputara nime Akwukwo Nso:
  “Chineke, Onye n’apugh ikwu okwu ugha.”
  “Elu-igwe na uwa gagabiga,
  ma okwu nile nkem agagh-agabiga ma-oli.”
  Ihe nile ga-emezu.

  Pita onye-ozi dere si:
  “N’ụbọchị ikpe-azụ ndi ochi na ndi emo n’asikwa,
  ‘Ole ebe nkwa nke obibia Ya di?
  N'ihi na site n'ubochi nna ayi ha dara n'ura onwu,
  ihe nile nadigide dika ha diworo site na nmalite nke okike.’”

  Ma Akwukwo Nso n’asi kwa:
  “Onye nwe ayi anoghi odu n'ime nkwa-Ya,
  dika ufodu n’agu ya na obu ino odu;
  kama O natachiri unu ogologo ntachi-obi,
  n'ihi na O zubeghi ka ndi obula la n’iyi,
  kama ka madu nile bia rue ncheghari.”

  Onye-nwe-ayi n’echere ka i si na nmehie-i chegharia
  ma nara Ya dika Onye Nzoputa-i.
  “O bu kwa n’ihi nka ka Jehova gechere imere unu amara.”
  N'ihi na le ka nwa oge gabia,
  “O gaghi ano kwa odu.”
  Mgbe onu uzo nke nzoputa ga-emechi rue mgbe ebigh-ebi.

  Site na okwu Chineke, bu Akwukwo Nso,
  ayi mutara na obibia Onye-nwe-ayi gadi uzo abua:
  — Mbu, O gabia na mbara elu-igwe ikporo ndi nile kwere na Ya
  — E mesia, O gabia n’uwa dika Eze na Onye ikpe.

  Pol onye-ozi dere:
  “N'ihi na Onye-nwe-ayi Onwe-Ya gewere oke ikpo-oku,
  were olu isi-mo-ozi, were kwa opi nke Chineke
  si n’elu-igwe ridata;
  ndi nwuru nime Kraist gebu kwa uzo si n’onwu bilie.
  Mgbe ahu ayi onwe ayi,
  bu ndi kwere na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,
  bu ndi no na ndu, ndi anarapu,
  ayi na ha ka ageweliko n’igwe-oji izute Onye-nwe-ayi
  nime mbara elu-igwe,
  otu a ka ayi na Onye-nwe-ayi gano kwa mgbe nile.”

  Nka puru ime mgbe obula.
  Jisus Onwe-ya kwuru si ayi:
  “Amatagh ubochi ahu ma-obu oge hour ahu.”
  Bu mgbe O gabia.

  Uwa ganaga kwa dika osi n’aga,
  mgbe ahu n’otu ntabi anya,
  igwe madu g’efu,
  ndi nile bu ezi ndi kwere na Kraist
  geso Onye-nwe-ayi n’ogide n’elu-igwe ebigh-ebi.


  Were onwe-gi nyefe Onye-Nzoputa tupu Ya abia,
  ma obu aga arapu gi n’azu iso
  igafe nime mbibi a di oke egwu
  nke akwukwo ikpe-azu nke Akwukwo Nso (bu Nkpughe)
  n’agwa ayi bayere ya.
  Jisus kwuru bayere ubochi ikpe-azu ndi-ahu si:
  “Nihi na mgbe ahu ka nkpagbu uku gadi,
  nke ihe dika ya akadigh site na nmalite uwa
  rue mgbe a, e-e, O gaghi adi kwa ma-oli.”

  Mgbe oge nkpagbu a nenwegh-imatu gasiri
  (aro-asa dika Daniel 9:24-27 kwuru),
  Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gabia n’ụwa
  na ebube Ya nile,
  na ndi-Mo-ozi na ndi nso,
  ma O ga-anokwasi na oche-eze Ya.
  “N’iru Ya ka ageme ka mba nile zuko:
  O gekewaputa kwa ha, otu n’aru ibe-ya,
  dika onye n’azu aturu nekewaputa aturu na umu ewu.”

  O ga-ekpe ha nile ikpe ziri-ezi,
  bu ndi n’ekwegh na Ya dika Onye-nwe-ayi.
  Mgbe ahu O ga-edozie ala-eze Ya
  ma O ga-achi, buru eze kachasi eze nile
  n’elu uwa dum.

  Oge o bibia nke Onye-nwe-ayi eruwala nso.
  ''Nkpagbu nke mba di iche-iche ya
  na mgbagoju anya''
  agha na akuko agha di iche-iche,''
  Unwu, oria, ala oma-jijiji'',
  ''Obi ndi madu nada site n’egwu
  site kwa na ile-anya ihe nabiakwasi n’elu-uwa dum
  madu bi'' na oke ikpo-asi megide Israel
  ha nile bu ihe nriba ama Akwukwo Nso kwuru maka obibia Ya.

  Obu ayi anaghi ahu nmalite ihe ndia ta?
  Uda oke-ifufe nke obibia ikpe ahu
  n’adasi-ike nezie.

  ''Gbapu n’ihi ndu gi!''
  ''Gbanari iwe gaje ibia!''
  Nka bu ido-aka nti nke Chineke nye gi.


  Otu Jisus a nke agoziri agozi
  onye biara n’ụwa dika nnu-aro ise gara aga
  nwuchitara ndi nmehie onwu bu
  onye i nmehiere megide.
  O n’ario gi ugbua ka ibia,
  ma kwuputa nmehie gi nile nye Ya,
  na O ga-agbahara gi n’obi oma
  ma sacha gi ocha karia snow.

  “Obara Jisus, bu Okpara Ya (Chineke),
  nasachapu kwa ayi nmehie nile.”
  Nkea bu nani uzo i ga ewezuga nmehie gi.

  O huru gi na anya,
  ma na-chokwa gi ibu gi Onye-nzoputa.
  Ma oburu i naraghi Ya,
  O ghaghi ibu onye-ikpe gi.
  Biakute Ya ugbuaiga ejikere izute Ya
  mgbe Oga-abia, ma i ga enwe ngozi ebigh-ebi.

📖 Le anya n'ibe ndia na Akwukwo Nso:

(1) Olu Ndi Ozi 1:11 (2) Jon 14:2,3 (3) Nkpughe 22:20 (4) Titus 1:2 (5) Matiu 24:35
(6) 2 Pita 3:4,9 (7) Isa. 30:18 (8) Hibru 10:37 (9) 1 Thess. 4:16 (10) Matiu 25:13
(11) Lee Nkpughe 6–19 (12) Matiu 24:21 (13) Matiu 25:31,32 (14) Lee Nkpughe 19:11–21
(15) Matiu 24:3–9, Luk 21:25–28 (16) 1 Jon 1:7

— R. K. Campbell

Related Products

What is the Truth?

Discover why Jesus’ crucifixion was essential for humanity's salvation as confirmed by prophecies and eyewitness accounts!

Weight of Sin

Explore how God's perfect mercy and justice intersect through the sacrifice of Christ for mankind!

Do you know the humble King?

Discover the humble yet noble journey of God's incarnation as Jesus Christ, offering wisdom, love, and forgiveness!

How to know God

Discover the unique oneness of God and learn how to truly know Him through His infallible word!

Do you know your enemies

Discover your internal enemies and find peace through faith with this inspiring message of salvation!

Karma vs Krupa

Discover how Jesus Christ offers a way out of karma with grace and forgiveness, transforming lives today!

KnowMessiah

Discover if Jesus is the promised Messiah with biblical evidence. Learn how He fulfills ancient prophecies!

Jewish Discovery of a Lifetime

Discover the Jewish quest for atonement and how it leads to finding salvation through Jesus' blood. Explore faith beyond rituals!

Why Believe It?

Explore why the Bible is unshakable and vital through a student's insightful reflection on its enduring impact and divine inspiration. Discover timeless wisdom!

What's Life?

Discover the true meaning of life with Jesus Christ. Find everlasting joy, peace, and fulfillment through faith!

U Turn

Transform your life through repentance and discover the path to eternal peace with Jesus Christ! 🔄✝️

Trapped

Discover how to escape the snares of sin and find freedom through Jesus Christ! 🌿✝️

Those Guilty Stains

Explore how the Bible offers a path from guilt and sin to forgiveness through Jesus Christ! Transform your story today! 🌟✝️

ThisThingWorks

Discover how faith and belief in Jesus Christ can transform your life. This personal story of an intercollegiate boxing champion reveals the power of salvation! 🌟✝️

They Gambled and Lost

Discover life-changing stories of those who gambled with drugs, lost, and found redemption through Jesus Christ. Choose to win! 🌟✝️

Problem with Patty

Explore the fleeting nature of life and embrace eternal joy through Jesus Christ. Discover how to secure a future beyond earthly bounds.

ImHereFor

Discover why living for temporary pleasures can lead to eternal consequences. Find true joy with Christ for a lifetime of happiness. 🌟✝️

GodYouDontKnow

Discover the God you didn't know yet! Explore ancient Athens through Paul's eyes and find faith in Jesus today. Embrace a relationship with the true Creator revealed in Scripture. 🌟🙏

We use cookies

We use cookies to ensure you get the best experience on our website. For more information on how we use cookies, please see out cookie policy. Cookie Policy