Igbo3

O NA-ABIA OZO

$0.04

Nke a bụ ozi gbasara mbilite Jisus Kraist, oku ka mmadụ nile nabata Onye-nzoputa tupu ụbọchị ikpe ikpeazụ, na amara Chineke.

0.00 reviews
Login to rate

Quantity

01

Shipping Cost: $0.00

IgboTractsForeign Tracts

O NA-ABIA OZO


Onye na-abia?
  ‘Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu no rigo n'elu-igwe,
  gabia n'otu aka ahu dika unu kiriri Ya ka O nagan'elu-igwe.’
  Ndi Mo-Ozi abua gwara ndi neso uzo Ya nka, mgbe ha no na
  mgbaru iru ka ha n’ele anya n’elu-igwe, ebe Onye Nzoputa
  na Onye-nwe ha na-arigoro n’elu-igwe.

  Jisus Kraist kwekwara nkwa mgbe O nori n’uwa si:
  “A namaga idoziri unu ebe... A gajem ibia ozo,
  M'ganara kwa unu nye onwem.”
  Mgbe ihe dika ogu aro ato gasiri,
  Kraist kwukwara ya ozo site n’elu-igwe maka nlata Ya n’uwa
  megbe O siri: “E anam abia ososo.”

  O bibia ugbo abua nke Kraist doro anya,
  buru kwa ezi okwu edeputara nime Akwukwo Nso:
  “Chineke, Onye n’apugh ikwu okwu ugha.”
  “Elu-igwe na uwa gagabiga,
  ma okwu nile nkem agagh-agabiga ma-oli.”
  Ihe nile ga-emezu.

  Pita onye-ozi dere si:
  “N’ụbọchị ikpe-azụ ndi ochi na ndi emo n’asikwa,
  ‘Ole ebe nkwa nke obibia Ya di?
  N'ihi na site n'ubochi nna ayi ha dara n'ura onwu,
  ihe nile nadigide dika ha diworo site na nmalite nke okike.’”

  Ma Akwukwo Nso n’asi kwa:
  “Onye nwe ayi anoghi odu n'ime nkwa-Ya,
  dika ufodu n’agu ya na obu ino odu;
  kama O natachiri unu ogologo ntachi-obi,
  n'ihi na O zubeghi ka ndi obula la n’iyi,
  kama ka madu nile bia rue ncheghari.”

  Onye-nwe-ayi n’echere ka i si na nmehie-i chegharia
  ma nara Ya dika Onye Nzoputa-i.
  “O bu kwa n’ihi nka ka Jehova gechere imere unu amara.”
  N'ihi na le ka nwa oge gabia,
  “O gaghi ano kwa odu.”
  Mgbe onu uzo nke nzoputa ga-emechi rue mgbe ebigh-ebi.

  Site na okwu Chineke, bu Akwukwo Nso,
  ayi mutara na obibia Onye-nwe-ayi gadi uzo abua:
  — Mbu, O gabia na mbara elu-igwe ikporo ndi nile kwere na Ya
  — E mesia, O gabia n’uwa dika Eze na Onye ikpe.

  Pol onye-ozi dere:
  “N'ihi na Onye-nwe-ayi Onwe-Ya gewere oke ikpo-oku,
  were olu isi-mo-ozi, were kwa opi nke Chineke
  si n’elu-igwe ridata;
  ndi nwuru nime Kraist gebu kwa uzo si n’onwu bilie.
  Mgbe ahu ayi onwe ayi,
  bu ndi kwere na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,
  bu ndi no na ndu, ndi anarapu,
  ayi na ha ka ageweliko n’igwe-oji izute Onye-nwe-ayi
  nime mbara elu-igwe,
  otu a ka ayi na Onye-nwe-ayi gano kwa mgbe nile.”

  Nka puru ime mgbe obula.
  Jisus Onwe-ya kwuru si ayi:
  “Amatagh ubochi ahu ma-obu oge hour ahu.”
  Bu mgbe O gabia.

  Uwa ganaga kwa dika osi n’aga,
  mgbe ahu n’otu ntabi anya,
  igwe madu g’efu,
  ndi nile bu ezi ndi kwere na Kraist
  geso Onye-nwe-ayi n’ogide n’elu-igwe ebigh-ebi.


  Were onwe-gi nyefe Onye-Nzoputa tupu Ya abia,
  ma obu aga arapu gi n’azu iso
  igafe nime mbibi a di oke egwu
  nke akwukwo ikpe-azu nke Akwukwo Nso (bu Nkpughe)
  n’agwa ayi bayere ya.
  Jisus kwuru bayere ubochi ikpe-azu ndi-ahu si:
  “Nihi na mgbe ahu ka nkpagbu uku gadi,
  nke ihe dika ya akadigh site na nmalite uwa
  rue mgbe a, e-e, O gaghi adi kwa ma-oli.”

  Mgbe oge nkpagbu a nenwegh-imatu gasiri
  (aro-asa dika Daniel 9:24-27 kwuru),
  Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gabia n’ụwa
  na ebube Ya nile,
  na ndi-Mo-ozi na ndi nso,
  ma O ga-anokwasi na oche-eze Ya.
  “N’iru Ya ka ageme ka mba nile zuko:
  O gekewaputa kwa ha, otu n’aru ibe-ya,
  dika onye n’azu aturu nekewaputa aturu na umu ewu.”

  O ga-ekpe ha nile ikpe ziri-ezi,
  bu ndi n’ekwegh na Ya dika Onye-nwe-ayi.
  Mgbe ahu O ga-edozie ala-eze Ya
  ma O ga-achi, buru eze kachasi eze nile
  n’elu uwa dum.

  Oge o bibia nke Onye-nwe-ayi eruwala nso.
  ''Nkpagbu nke mba di iche-iche ya
  na mgbagoju anya''
  agha na akuko agha di iche-iche,''
  Unwu, oria, ala oma-jijiji'',
  ''Obi ndi madu nada site n’egwu
  site kwa na ile-anya ihe nabiakwasi n’elu-uwa dum
  madu bi'' na oke ikpo-asi megide Israel
  ha nile bu ihe nriba ama Akwukwo Nso kwuru maka obibia Ya.

  Obu ayi anaghi ahu nmalite ihe ndia ta?
  Uda oke-ifufe nke obibia ikpe ahu
  n’adasi-ike nezie.

  ''Gbapu n’ihi ndu gi!''
  ''Gbanari iwe gaje ibia!''
  Nka bu ido-aka nti nke Chineke nye gi.


  Otu Jisus a nke agoziri agozi
  onye biara n’ụwa dika nnu-aro ise gara aga
  nwuchitara ndi nmehie onwu bu
  onye i nmehiere megide.
  O n’ario gi ugbua ka ibia,
  ma kwuputa nmehie gi nile nye Ya,
  na O ga-agbahara gi n’obi oma
  ma sacha gi ocha karia snow.

  “Obara Jisus, bu Okpara Ya (Chineke),
  nasachapu kwa ayi nmehie nile.”
  Nkea bu nani uzo i ga ewezuga nmehie gi.

  O huru gi na anya,
  ma na-chokwa gi ibu gi Onye-nzoputa.
  Ma oburu i naraghi Ya,
  O ghaghi ibu onye-ikpe gi.
  Biakute Ya ugbuaiga ejikere izute Ya
  mgbe Oga-abia, ma i ga enwe ngozi ebigh-ebi.

📖 Le anya n'ibe ndia na Akwukwo Nso:

(1) Olu Ndi Ozi 1:11 (2) Jon 14:2,3 (3) Nkpughe 22:20 (4) Titus 1:2 (5) Matiu 24:35
(6) 2 Pita 3:4,9 (7) Isa. 30:18 (8) Hibru 10:37 (9) 1 Thess. 4:16 (10) Matiu 25:13
(11) Lee Nkpughe 6–19 (12) Matiu 24:21 (13) Matiu 25:31,32 (14) Lee Nkpughe 19:11–21
(15) Matiu 24:3–9, Luk 21:25–28 (16) 1 Jon 1:7

— R. K. Campbell

Related Products

What is the Truth?

What is the Truth?

The Weight of SIN

The Weight of SIN

Do you know the Humble King?

Do you know the Humble King?

How To Know GOD

How To Know GOD

Do you know your ENEMIES?

Do you know your ENEMIES?

KARMA versus KRUPA

KARMA versus KRUPA

Do You Know the Messiah?

Do You Know the Messiah?

Jewish Discovery of a Lifetime

Jewish Discovery of a Lifetime

Why Believe It?

Why Believe It?

When should you think about CHRIST?

When should you think about CHRIST?

When God Knows Your Your Name

When God Knows Your Your Name

What's Life?

What's Life?

U-Turn

U-Turn

Trapped!

Trapped!

Those Guilty Stains

Those Guilty Stains

THIS THING WORKS!

THIS THING WORKS!

They Gambled and Lost! Will You?

They Gambled and Lost! Will You?

The Problem with Patty

The Problem with Patty

I’m Here for a Good Time

I’m Here for a Good Time

The You Don't Know Yet

The You Don't Know Yet

We use cookies

We use cookies to ensure you get the best experience on our website. For more information on how we use cookies, please see out cookie policy. Cookie Policy