
O NA-ABIA OZO
$0.04Nke a bแปฅ ozi gbasara mbilite Jisus Kraist, oku ka mmadแปฅ nile nabata Onye-nzoputa tupu แปฅbแปchแป ikpe ikpeazแปฅ, na amara Chineke.
Quantity
Shipping Cost: $0.00
We use cookies to ensure you get the best experience on our website. For more information on how we use cookies, please see out cookie policy. Cookie Policy
$0.04
Onye na-abia?
โโโJisus nka, Onye anapuru n'ebe unu no rigo n'elu-igwe,
โโgabia n'otu aka ahu dika unu kiriri Ya ka O nagan'elu-igwe.โ
โโNdi Mo-Ozi abua gwara ndi neso uzo Ya nka, mgbe ha no na
โโmgbaru iru ka ha nโele anya nโelu-igwe, ebe Onye Nzoputa
โโna Onye-nwe ha na-arigoro nโelu-igwe.
โโJisus Kraist kwekwara nkwa mgbe O nori nโuwa si:
โโโA namaga idoziri unu ebe... A gajem ibia ozo,
โโM'ganara kwa unu nye onwem.โ
โโMgbe ihe dika ogu aro ato gasiri,
โโKraist kwukwara ya ozo site nโelu-igwe maka nlata Ya nโuwa
โโmegbe O siri:ย โE anam abia ososo.โ
โโO bibia ugbo abua nke Kraist doro anya,
โโburu kwa ezi okwu edeputara nime Akwukwo Nso:
โโโChineke, Onye nโapugh ikwu okwu ugha.โ
โโโElu-igwe na uwa gagabiga,
โโma okwu nile nkem agagh-agabiga ma-oli.โ
โโIhe nile ga-emezu.
โโPita onye-ozi dere si:
โโโNโแปฅbแปchแป ikpe-azแปฅ ndi ochi na ndi emo nโasikwa,
โโโOle ebe nkwa nke obibia Ya di?
โโN'ihi na site n'ubochi nna ayi ha dara n'ura onwu,
โโihe nile nadigide dika ha diworo site na nmalite nke okike.โโ
โโMa Akwukwo Nso nโasi kwa:
โโโOnye nwe ayi anoghi odu n'ime nkwa-Ya,
โโdika ufodu nโagu ya na obu ino odu;
โโkama O natachiri unu ogologo ntachi-obi,
โโn'ihi na O zubeghi ka ndi obula la nโiyi,
โโkama ka madu nile bia rue ncheghari.โ
โโOnye-nwe-ayi nโechere ka i si na nmehie-i chegharia
โโma nara Ya dika Onye Nzoputa-i.
โโโO bu kwa nโihi nka ka Jehova gechere imere unu amara.โ
โโN'ihi na le ka nwa oge gabia,
โโโO gaghi ano kwa odu.โ
โโMgbe onu uzo nke nzoputa ga-emechi rue mgbe ebigh-ebi.
โโSite na okwu Chineke, bu Akwukwo Nso,
โโayi mutara na obibia Onye-nwe-ayi gadi uzo abua:
โโโ Mbu, O gabia na mbara elu-igwe ikporo ndi nile kwere na Ya
โโโ E mesia, O gabia nโuwa dika Eze na Onye ikpe.
โโPol onye-ozi dere:
โโโN'ihi na Onye-nwe-ayi Onwe-Ya gewere oke ikpo-oku,
โโwere olu isi-mo-ozi, were kwa opi nke Chineke
โโsi nโelu-igwe ridata;
โโndi nwuru nime Kraist gebu kwa uzo si nโonwu bilie.
โโMgbe ahu ayi onwe ayi,
โโbu ndi kwere na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,
โโbu ndi no na ndu, ndi anarapu,
โโayi na ha ka ageweliko nโigwe-oji izute Onye-nwe-ayi
โโnime mbara elu-igwe,
โโotu a ka ayi na Onye-nwe-ayi gano kwa mgbe nile.โ
โโNka puru ime mgbe obula.
โโJisus Onwe-ya kwuru si ayi:
โโโAmatagh ubochi ahu ma-obu oge hour ahu.โ
โโBu mgbe O gabia.
โโUwa ganaga kwa dika osi nโaga,
โโmgbe ahu nโotu ntabi anya,
โโigwe madu gโefu,
โโndi nile bu ezi ndi kwere na Kraist
โโgeso Onye-nwe-ayi nโogide nโelu-igwe ebigh-ebi.
โโWere onwe-gi nyefe Onye-Nzoputa tupu Ya abia,
โโma obu aga arapu gi nโazu iso
โโigafe nime mbibi a di oke egwu
โโnke akwukwo ikpe-azu nke Akwukwo Nso (bu Nkpughe)
โโnโagwa ayi bayere ya.
โโJisus kwuru bayere ubochi ikpe-azu ndi-ahu si:
โโโNihi na mgbe ahu ka nkpagbu uku gadi,
โโnke ihe dika ya akadigh site na nmalite uwa
โโrue mgbe a, e-e, O gaghi adi kwa ma-oli.โ
โโMgbe oge nkpagbu a nenwegh-imatu gasiri
โโ(aro-asa dika Daniel 9:24-27 kwuru),
โโOnye-nwe-ayi Jisus Kraist gabia nโแปฅwa
โโna ebube Ya nile,
โโna ndi-Mo-ozi na ndi nso,
โโma O ga-anokwasi na oche-eze Ya.
โโโNโiru Ya ka ageme ka mba nile zuko:
โโO gekewaputa kwa ha, otu nโaru ibe-ya,
โโdika onye nโazu aturu nekewaputa aturu na umu ewu.โ
โโO ga-ekpe ha nile ikpe ziri-ezi,
โโbu ndi nโekwegh na Ya dika Onye-nwe-ayi.
โโMgbe ahu O ga-edozie ala-eze Ya
โโma O ga-achi, buru eze kachasi eze nile
โโnโelu uwa dum.
โโOge o bibia nke Onye-nwe-ayi eruwala nso.
โโ''Nkpagbu nke mba di iche-iche ya
โโna mgbagoju anya''
โโagha na akuko agha di iche-iche,''
โโUnwu, oria, ala oma-jijiji'',
โโ''Obi ndi madu nada site nโegwu
โโsite kwa na ile-anya ihe nabiakwasi nโelu-uwa dum
โโmadu bi'' na oke ikpo-asi megide Israel
โโha nile bu ihe nriba ama Akwukwo Nso kwuru maka obibia Ya.
โโObu ayi anaghi ahu nmalite ihe ndia ta?
โโUda oke-ifufe nke obibia ikpe ahu
โโnโadasi-ike nezie.
โโ''Gbapu nโihi ndu gi!''
โโ''Gbanari iwe gaje ibia!''
โโNka bu ido-aka nti nke Chineke nye gi.
โโOtu Jisus a nke agoziri agozi
โโonye biara nโแปฅwa dika nnu-aro ise gara aga
โโnwuchitara ndi nmehie onwu bu
โโonye i nmehiere megide.
โโO nโario gi ugbua ka ibia,
โโma kwuputa nmehie gi nile nye Ya,
โโna O ga-agbahara gi nโobi oma
โโma sacha gi ocha karia snow.
โโโObara Jisus, bu Okpara Ya (Chineke),
โโnasachapu kwa ayi nmehie nile.โ
โโNkea bu nani uzo i ga ewezuga nmehie gi.
โโO huru gi na anya,
โโma na-chokwa gi ibu gi Onye-nzoputa.
โโMa oburu i naraghi Ya,
โโO ghaghi ibu onye-ikpe gi.
โโBiakute Ya ugbuaiga ejikere izute Ya
โโmgbe Oga-abia, ma i ga enwe ngozi ebigh-ebi.
(1) Olu Ndi Ozi 1:11โ(2) Jon 14:2,3โ(3) Nkpughe 22:20โ(4) Titus 1:2โ(5) Matiu 24:35
(6) 2 Pita 3:4,9โ(7) Isa. 30:18โ(8) Hibru 10:37โ(9) 1 Thess. 4:16โ(10) Matiu 25:13
(11) Lee Nkpughe 6โ19โ(12) Matiu 24:21โ(13) Matiu 25:31,32โ(14) Lee Nkpughe 19:11โ21
(15) Matiu 24:3โ9, Luk 21:25โ28โ(16) 1 Jon 1:7
โโฏR.โฏK.โฏCampbell

Nke a bแปฅ ozi gbasara mbilite Jisus Kraist, oku ka mmadแปฅ nile nabata Onye-nzoputa tupu แปฅbแปchแป ikpe ikpeazแปฅ, na amara Chineke.
Quantity
Shipping Cost: $0.00