
OZI OMA NKE UBOCHI TA !
$0.04Ihu-ntanya Chineke, ịhụnanya na nzoputa nke Jisus Kraist, nkwere, nchegharia, na ndu ebigh-ebi n'olu Akwukwo Nso.
Quantity
Shipping Cost: $0.00

Ihu-ntanya Chineke, ịhụnanya na nzoputa nke Jisus Kraist, nkwere, nchegharia, na ndu ebigh-ebi n'olu Akwukwo Nso.
Quantity
Shipping Cost: $0.00
Eweputara ihe ndia site nime akwukwo
dikasiri nkpa n'uwa.
IHUNANYA CHINEKE
"Ma Chineke néme ka ihu-n'tanya nke aka
Ya n'ebe ayi no puta ihe, n'ihi na, mgbe ayi
ng n'abu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi"
(Ndi Rom. 5:8)
"N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otu a,
na O nyere obuna Okpara O muru nani Ya,
ka onye obula nke kwere na Ya were ghara ila
ntiyi, kama ka 9 nwe ndu ebigh-ebi"
(Jon 3:16).
"N'ihi na Chineke bu ihu-n'anya. Nime nka ka emere ka ihu-n'anya Chineke puta ihe nime ayi,
na Chineke ewerewo Okpara O muru nani Ya zite n'uwa,
ka ayi di ndu site n'aka-Ya. Nime nka ka ihu-n'anya di,
o bugh na ayi onwe-ayi huru Chineke n'anya, kama o bu na Ya onwe-ya huru ayi n'anya,
we zite Okpara-Ya ka O buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi"
(1 Jon 4:8-10).
ODIGH ONYE OBULA DI NMA IBA NA ELU-IGWE
"O digh onye bu onye ezi omume, o digh otu onye ma-oli;
O digh onye naghota, O digh onye nacho Chineke;
Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abagh n'ihe m'otu;
O digh onye neme ihe oma, O digh obuna otu onye...
n'ihi na o digh ihe di iche; n'ihi na madu nile emehiewo,
ha adigh-eru kwa otuto Chineke"
(Ndi Rom, 3:10-12, 22, 23).
JISUS KRAIST BU ONYE NZOPUTA
(Meri)
"O gamuputa kwa Nwa-nwoke; i gakpo kwa aha-Ya Jisus;
n'ihi na Ya onwe-ya gazoputa ndi nke Ya na nmehie nile ha"
(Matiu 1:21).
.."Ma Ya (Kraist) onwe-ya buru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu"
(1 Pita 2:24).
"Ya onwe-ya bu onye amapuworo site na njehie nile nke ayi,
onye azopiaworo site na-ajo omume nile nke ayi:
ahuhunmehie nke udo-ayi di n'aru ya;
o bu kwa ubiri utari-ya ka ejiri me ka aru ayi di ike"
(Aisa 53:5).
", . . Oburu Kwa na nwusi obara adigh ngbaghara nmehie adigh"
(Ndi Hib. 9:22).
Qbara Jisus, bu Okpara-Ya (Chineke), nasachapu kwa ayi nmehie nile
(1 Jon 1:7).
"Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile...
Eli-kwara Ya... emeworo-Kwa-ra ka O si n’ onwu bilie n'ubochi nke-ato,
dika ihe edeworo n'akwukwo nso si di"
(1 Ndi Kor. 15:3, 4).
"Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndu na Onye-Nzoputa"
(Qlu Ndi Ozi 5:31).
KWERE, CHEGHARIA, MA NARA ONYE NZOPUTA
Owe si,
"Ndi-nwe-ayi, gini di nkpa ka m'me ka ewe zoputam?
Ha we si, kwere n'onye nwe-ayi Jisus, agazoputa kwa gi"
(Olu Ndi Ozi 16:30).
"N'ihi nka ka o we unu anya...
O bu kwa nime Onye a (Jisus Kraist) ka anagu onye o bula nke kwere na Ya
n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anapugh igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses...
Na Ya ka ndi-amuma nile nagbara ama, na site n'aha-Ya
onye 0 bula nke kwere na Ya ganata ngbaghara nmehie"
(Olu Ndi Ozi 13:39; 10:43).
"Onye kwere n'Okpara nwere ndu ebigh-ebi"
(Jon 3:36).
"Ya mere Chineke lefuru oge nile nke amagh ihe anya;
ma ugbua O nagwa madu ka ha nile chegharia ntebe nile,
ebe Q debeworo otu ubochi, nke O gekpe elu-uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume..."
(Qlu Ndi Ozi 17:30, 31).
(Pol onye ozi si)
"Anoyerem unu ri... nagwasi unuike... okwu ncheghari n'ebe Chineke no, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus no"
(Olu Ndi Ozi 20:21).
"Onye-nwe-ayi... kama O natachiri unu ogologo-ntachi-obi,
n'ihi na O zubeghi ka ndi o bula la n'tiyi, kama ka madu nile bia rue ncheghari"
(2 Pita 3:9).
"Ma ka ha ra, bu ndi nara Ya, ha ka O nyere ike igho umu Chineke, bu ndi kwere n'aha-Ya"
(Jon 1:12).
THE EKWEGH-EKWE N'EWETA
"Onye nekwegh okwu Chineke emewo Ya onye-ugha;
n'ihi na o kwegh n'ama ahu nke Chineke gbaworo bayere Okpara-Ya"
(1 Jon 5:10).
"Ekpewo onye nekwegh na Ya ikpe ugbua,
n'ihi na o kwegh n'aha nke Okpara Chineke nani Ya...
Ma onye nekwegh Okpara ahu agagh-ahu ndu, kama iwe Chineke nanogide n'aru-ya"
(Jon 3:18, 36).
"Ayi onwe-ayi gesi ana gbanari, ma o buru na ayi lefuru oke nzoputa di otu a anya?"
(Ndi Hibru 2:3).
"Ma ndi natu ujo, na ndi nekwegh ekwe, na ndi-aru, na ndi-ogbu-madu, na ndi nakwa iko,
na ndi nagwo nsi, na ndi nekpere arusi, na ndi-ugha nile, oke-ha gabu nime odo ahu nke ji oku na brimstone nere;
nke bu onwu nke-abua ahu"
(Nkpughe 21:8).
(Ayi nakpo gi ka i lezie anya, che uche ma genti n'ozi Chineke ziri madu.)
We use cookies to ensure you get the best experience on our website. For more information on how we use cookies, please see out cookie policy. Cookie Policy